17 Ma umu ndim asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi: ma ha onwe-ha, uzọ-ha ka anādighi-atule.
18 Mb͕e onye ezi omume si n'ezi omume-ya chigharia, me ajọ omume, ọ gānwu kwa nime ha.
19 Ma mb͕e onye nēmebi iwu si na nmebi-iwu-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume, n'ihi ihe ndia ka onye ahu gādi ndu.
20 Ma unu asiwo, Adighi-atule uzọ Onye-nwe-ayi. M'gēkpe unu ikpe, unu ulo Israel, onye ọ bula ka uzọ-ya nile si di.
21 O rue, n'arọ nke-iri-na-abua nke emere ka ayi je biri n'ala ọzọ, n'ọnwa nke-iri, n'ubọchi nke-ise nke ọnwa ahu, na otù onye nke siri na Jerusalem b͕apu biakuterem, si, Etikpọwo obodo-ayi.
22 Ma aka Jehova rurumri aru n'anyasi, tutu onye b͕apuru ab͕apu abia; O we saghe ọnum, rue mb͕e ọ biakuterem n'ututu; ewe saghe ọnum, m'we ghara ida kwa ob͕i ọzọ.
23 Okwu Jehova we ruem nti, si,