Ezikiel 33:8-14 IGBOB

8 Mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, Gi onye nēmebi iwu, i ghaghi inwu, ma i kwughi kwa okwu idọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta; onye ahu nke nēmebi iwu gānwu n'ajọ omume-ya; ma n'aka-gi ka M'gājuta ọbara-ya.

9 Ma gi onwe-gi, mb͕e i gādọ onye nēmebi iwu aka na nti ka o si n'uzọ-ya puta ka o we si nime ya chigharia, ma o sighi n'uzọ-ya chigharia; onye ahu gānwu n'ajọ omume-ya, ma gi onwe-gi, nkpuru-obi-gi ka i naputaworo.

10 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si ulo Israel: Otú a ka unu nēkwu, si, N'ezie njehie nile ayi na nmehie nile ayi di n'isi-ayi, ọ bu kwa nime ha ka ayi onwe-ayi nāta aru; àyi gēsi kwa aṅa di ndu?

11 Si ha, Mu onwem nādi ndu, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta), ọnwu nke onye nēmebi iwu adighi-atọm utọ ma-ọli; kama ọ nātọm utọ mb͕e onye nēmebi iwu si n'uzọ-ya chigharia, we di ndu: chigharianu, sinu n'uzọ ọjọ nile unu chigharia; ọ̀ bu kwa n'ihi gini ka unu gānwu, ulo Israel?

12 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, si umu ndim, Ezi omume nke onye ezi omume agaghi-anaputa ya anaputa n'ubọchi njehie-ya; ọzọ, nmebi-iwu nke onye nēmebi iwu, ọ gaghi-asu ngọngọ nime ya n'ubọchi o si na nmebi-iwu-ya chigharia: ọzọ kwa, onye ezi omume apughi idi ndu nime ya n'ubọchi o mehiere.

13 Mb͕e M'nāsi onye ezi omume, na ọ ghaghi idi ndu, onye ahu ewe tukwasi obi n'ezi omume-ya, me ajọ omume, ezi omume-ya nile, agaghi-echeta ha; ma n'ajọ omume-ya nke o meworo, nime ya ka ọ gānwu.

14 Ọzọ, mb͕e M'nāsi onye nēmebi iwu, I ghaghi inwu; o we si na nmehie-ya chigharia, me ihe ekpere n'ikpe na ezi omume;