15 Mu onwem gāzù ìgwè ewu na aturu nkem, Mu onwem gēme kwa ka ha makpue amakpu; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
16 Nke furu efu ka M'gāchọ, ọ bu kwa nke achufuru achufu ka M'gēwelata, ọkpukpu ab͕ajiri ab͕aji ka M'gēkezi kwa, nke aru-ya nādighi ike ka M'gēme kwa ka ọ di ike: ma nke mara abuba na nke di ike ka M'gēkpochapu; M'gāzù ha n'ikpé ziri ezi.
17 Ma unu onwe-unu, ìgwè ewu na aturu nkem, otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu nēkpe ikpe n'etiti anu na anu, ma ebulu ma nkpi.
18 Ọ̀ bu unu ihe ntà na unu ji ezi ihe-ọzùzù-aturu azù onwe-unu, ma unu gāzọtọ ihe-ọzùzù-aturu-unu fọdurunu n'ukwu-unu? ọ̀ bu kwa unu ihe ntà na ọ bu miri doro edo ka unu nāṅu, ma unu gāb͕aru miri fọdurunu n'ukwu-unu?
19 Ma ìgwè ewu na aturu nkem, ọ bu ihe ukwu-unu zọtọrọ ka ha ji azù onwe-ha, ọ bu kwa miri ukwu-unu b͕aruru ka ha nāṅu.
20 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Le, Mu, ọbuná Mu onwem, gēkpe kwa ikpe n'etiti anu mara abuba na anu tara aru.
21 N'ihi na unu ji akuku na ubu-aka enuzuga, na n'ihi na unu ji mpi-unu asọzuga anu nile nāria ọria, rue mb͕e unu chusasiri ha n'èzi;