Ezikiel 36:1-7 IGBOB

1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, buere ugwu nile nke Israel amuma, si, Unu ugwu Israel, nurunu okwu Jehova.

2 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na onye-iro asiwo megide unu, Ehe! na, Ebe di elu nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga aghọworo ayi ihe-nnweta:

3 n'ihi nka bue amuma, si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na, ọbuná n'ihi na ha emewo ka unu tọb͕ọrọ n'efu, na n'ihi na ha eledawo unu buruburu, ka unu we ghọrọ mba nile fọdurunu ihe-nnweta, ewe me ka unu rigokwasi n'eb͕ub͕ere-ọnu nke ndi-ire, buru akukọ ọjọ nke ndi-unu:

4 n'ihi nka, unu ugwu Israel, nurunu okwu nke Onye-nwe-ayi Jehova; Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri ugwu nile na ugwu ntà nile na ebe nile miri si erù na ndagwurugwu nile na nkpọnkpọ ebe nile nke tọb͕ọrọ n'efu na obodo nile anapuru anapu, nke ghọwo-kwa-ra mba nile fọdurunu nke di buruburu ihe-nluta-n'agha na ihe-ikwa-emò:

5 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ezie n'ọku nke ekworom ka M'kwuworo okwu megide mba nile fọduru, megide kwa Edom nile, ndi wereworo alam nye onwe-ha ibu ihe-nnweta n'ọṅù nke obi-ha nile, nime nlelì nke nkpuru-obi-ha, ka ha we chupu ya ka ọ ghọ ihe-nluta-n'agha:

6 n'ihi nka bue amuma bayere ala Israel, si ugwu-ya nile, si kwa ugwu ntà ya nile, si ebe-ya nile miri si erù, si kwa ndagwurugwu-ya nile, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Lem anya, n'ekworom na n'ọnumam ka M'kwuworo okwu, n'ihi na ọ bu ọnọdu-ihere nke mba di iche iche ka unu būruworo:

7 n'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Mu onwem eweliwo akam elu, si, N'ezie mba nile ndi di unu buruburu, ha onwe-ha gēbu ọnọdu-ihere-ha.