11 M'gēme kwa ka madu na anumanu ba uba n'elu unu; ha gāba kwa uba, mua ọmùmù: M'gēme kwa ka madu bi nime unu dika ọnọdu mb͕e ochie unu si di, M'gēme kwa unu nma karia na mb͕e mbu unu: unu ewe mara na Mu onwem bu Jehova.
12 M'gēme kwa ka madu jegharia n'elu unu, ọbuná ndim, bú Israel; ha gēnweta kwa gi, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-nketa, i gaghi-ab͕aba kwa ha aka umu ọzọ ma-ọli.
13 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na ha nāsi unu, Ala nke nēri madu ka i bu, ala nke nāb͕aba mba-gi aka umu ka i buworo;
14 n'ihi nka i gaghi-eri kwa madu ọzọ, i gaghi-ab͕aba kwa mba-gi aka umu ọzọ, (ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta);
15 M'gaghi-eme kwa ka i nuru ọnọdu-ihere mba nile ọzọ, i gaghi-ebu kwa ita-uta nke ndi nile di iche iche ọzọ, i gaghi-eme kwa ka mba-gi su ngọngọ ọzọ; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
16 Okwu Jehova we ruem nti, si,
17 Nwa nke madu, mb͕e ulo Israel bi n'elu ala-ha, ha we merua ya site n'uzọ-ha, site kwa n'omume nile ha: dika iru-árú nke nwanyi di na nsọ, otú a ka uzọ-ha diri n'irum.