1 Aka Jehova we dikwasim, O we me ka m'pua apu nime Mọ nke Jehova, O we dọbam n'etiti ndagwurugwu ahu; ma ndagwurugwu ahu juputara n'ọkpukpu;
2 O we me ka m'gabiga n'akuku ha buruburu n'akuku nile: ma, le, ha bara uba nke-uku n'elu ndagwurugwu; ma, le, ha kpọrọ nku nke-uku.
3 O we sim, Nwa nke madu, Ọkpukpu ndia, hà gādi ndu? M'we si, Onye-nwe-ayi Jehova, Gi onwe-gi mara.
4 O we sim, Bue amuma n'elu ọkpukpu ndia, si ha, Unu ọkpukpu kpọrọ nku, nurunu okwu Jehova.