1 Okwu Jehova we ruem nti, si,
2 Nwa nke madu, che iru-gi na Gog, nke ala Megog, bú onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal, bue amuma megide ya,
3 si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Le, Mu onwem nēmegide gi, Gog, onye-isi nke Rosh na nke Meshek na nke Tubal:
4 M'gēchighari gi, tiye nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka i puta, gi na usu-ndi-agha-gi nile, ma inyinya ma ndi-inyinya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha nile, ọ bu nkpọkọta madu bara uba chiri ọta uku na ọta, ndi nējide mma-agha, ha nile:
5 Peasia na Etiopia na Put soro ha; ha nile chiri ọta na okpu-agha:
6 Goma na usu-ndi-agha-ya nile; ulo Togama nke akuku Ugwu dikarisiri anya, na usu-ndi-agha-ya nile: ọbuná ọtutu ndi di iche iche so gi.