24 Dika iru-árú-ha si di na dika njehie nile ha si di, otú a ka M'mere ha: M'we zonari ha irum.
25 N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: Ub͕u a ka M'gēme ka ndi Jekob adọtara n'agha lata, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru ulo Israel nile; M'gēkwo-kwa-ra aha nsọm ekworo.
26 Ha gēbu kwa ihere-ha, na nmekpu nile ha nke ha mekpuworo megidem, mb͕e ha gēbi n'ala-ha na ntukwasi-obi, mb͕e ọ gaghi-adi onye ọ bula nēme ka ha ma jijiji;
27 mb͕e M'gēmewori ka ha si n'etiti ndi nile di iche iche lata, mb͕e M'gāchikọputawo ha-ri n'ala nile nke ndi-iro-ha, ewe dom nsọ nime ha n'anya ọtutu mba.
28 Ha gāma kwa na Mu onwem bu Jehova, bú Chineke-ha, ebe M'mere ka ha je biri n'ala ọzọ n'etiti mba nile, M'we chikọba ha n'ala-ha; M'gaghi-eme kwa ka onye ọ bula nime ha fọdu n'ebe ahu ọzọ;