4 O we tùa ogologo-ya, orú cubit, na obosara-ya, orú cubit, n'iru ulo uku Chineke: o we sim, Nka bu ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile.
5 O we tùa mb͕idi ulo ahu, cubit isi; na obosara nke ulo ntà nke akuku n'otù n'otù, cubit anọ, buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula.
6 Ulo ntà nke akuku di kwa otù ulo ntà nke akuku n'elu ulo ntà nke akuku ọzọ okpukpu atọ, ha di kwa orú na iri n'usoro; ha we ba nime mb͕idi ahu nke diri ulo ahu bayere ulo ntà nke akuku di ya buruburu n'akuku nile, ka ha we jide mb͕idi ahu, ghara ijide mb͕idi ulo onwe-ya.
7 Ulo ntà nke akuku ndia di obosara kari ka ha nāla elu elu n'idi ulo ahu buruburu; n'ihi na idi ulo ahu buruburu nāla elu elu buruburu ulo ahu n'akuku nile: n'ihi nka obosara nke diri ulo ahu di uku kari n'elu; otú a anēsi n'ulo ntà di ala rigorue ulo ntà kachasi elu site n'ulo ntà di n'etiti.
8 M'we hu na ulo ahu nwere ebe di elu buruburu n'akuku nile: ntọ-ala nile nke ulo ntà nke akuku bu ogologo zuru ezu nke ami ahu eji atù ihe, bú cubit uku isi.
9 Ib͕idi nke mb͕idi ahu, nke diri ulo ntà nke akuku, n'èzí, di cubit ise: ma nke fọduru bu ọnọdu nke ulo ntà nke akuku nke diri ulo ahu.
10 N'etiti ime-ulo abua ọ di orú cubit n'obosara buruburu ulo ahu n'akuku nile ọ bula.