1 O we me ka m'laghachi n'uzọ ọnu-uzọ-ama nke ebe nsọ ahu nke di n'èzí, nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma ọnu-uzọ-ama ahu bu nke emechiri emechi.
2 Jehova we sim, Ọnu-uzọ nka gābu ihe emechiri emechi, agaghi-emeghe ya, ọ dighi kwa onye ọ bula gēsi ya bata, n'ihi na Jehova, bú Chineke nke Israel, esiwo ya bata; o we buru ihe emechiri emechi.
3 Ma onye-isi-unu, dika onye-isi ka ya onwe-ya gānọdu ala nime ya iri nri n'iru Jehova; ọ gēsi uzọ nke uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama nka bata, si kwa uzọ-ya pua.
4 O we me ka m'bia n'uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu n'iru ulo ahu; m'we hu, ma le, ebube Jehova juputara ulo Jehova: m'we da kpuchie irum n'ala.
5 Jehova we sim, Nwa nke madu, tukwasi obi-gi, were anya-gi abua hu, were nti-gi abua nu ihe ahu nile nke Mu onwem nāgwa gi bayere ukpuru nile nke ulo Jehova, baye-kwa-ra iwu-ya nile; tukwasi kwa obi-gi na nbata ulo a, ya na ọpupu nile nke ebe nsọ a.