1 Ma mb͕e unu gēme ka ala-unu dayere onwe-unu n'ihe-nketa, unu gēbuliri Jehova àjà-nbuli, bú otù òkè di nsọ nke ala ahu: ogologo-ya gādi orú nnù amì uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, obosara-ya gādi kwa orú nnù na nnù ise: ihe nsọ ka ọ gābu n'ókè-ala-ya nile buruburu.
2 Site n'ala nka nnù ami na ọgu n'ogologo na nnù na ọgu ise n'obosara gādiri ebe nsọm, ọ gēnwe akuku anọ rara nrata buruburu; ma ọgu cubit abua na iri gāburu ya ebe-ita-nri buruburu.
3 Site n'ọtùtù a ka i gātù kwa, ogologo nke gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri, na obosara nke gādi orú nnù ami na nnù ise: ọ bu kwa nime ya ka ebe nsọ, nke bu ebe di nsọ kachasi ebe nsọ nile, gādi.
4 Òkè nsọ nke ala ahu ka ọ bu; ndi-nchu-àjà, bú ndi-oje-ozi nke ebe nsọ, gēnwe ya, bú ndi nābia nso ijere Jehova ozi; ọ gābu-kwa-ra ha ebe ulo nile ha gādi, na ebe nsọ diri ebe nsọ nkem.
5 Orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami na nnù ise n'obosara, gādiri ndi Livai, bú ndi-oje-ozi nke ulom, ighọrọ ha ihe-onwunwe, orú ime-ulo.