1 Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ọnu-uzọ-ama nke ogige di nime nke nēche iru n'Iru-anyanwu gābu ihe emechiri emechi n'ubọchi ọlu isi unu; ma n'ubọchi-izu-ike ka agēmeghe ya, ọ bu kwa n'ubọchi nke ọnwa ọhu ka agēmeghe ya.
2 Onye-isi gēsi kwa n'uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama n'èzí bata, guzo n'akuku akuku-ọnu-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, ndi-nchu-àjà gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya, na àjà-udo-ya nile, ọ gākpọ kwa isi ala na nbata-uzọ nke ọnu-uzọ-ama, we pua: ma agaghi-emechi ọnu-uzọ-ama rue anyasi.
3 Ndi ala nka gākpọ kwa isi ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ahu n'iru Jehova n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile.
4 Ma àjà-nsure-ọku nke onye-isi gēweta nso Jehova n'ubọchi-izu-ike bu umu-aturu isi zuru okè na otù ebulu zuru okè;