3 Ndi ala nka gākpọ kwa isi ala n'oghere ọnu-uzọ-ama ahu n'iru Jehova n'ubọchi-izu-ike nile, na n'ọnwa ọhu nile.
4 Ma àjà-nsure-ọku nke onye-isi gēweta nso Jehova n'ubọchi-izu-ike bu umu-aturu isi zuru okè na otù ebulu zuru okè;
5 onyinye-inata-iru-ọma bu kwa otù ephah bayere ebulu ahu, ọ gētiye kwa n'umu-aturu onyinye-inata-iru-ọma, bú onyinye nke aka-ya, ya na manu, otù hin diri otù ephah.
6 Ma n'ubọchi ọnwa ọhu ọ gābu nwa-oke-ehi zuru okè, na umu-aturu isi, na otù ebulu, ihe zuru okè ka ha gābu:
7 ọ bu kwa otù ephah etiyere n'oke-ehi ahu, na otù ephah etiyere n'ebulu ahu, na ihe etiyere n'umu-aturu ahu dika aka-ya gēru, na manu, otù, hin otù ephah, ka o gēji dozie onyinye-inata-iru-ọma.
8 Ma mb͕e onye-isi-unu gābata, uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama ahu ka ọ gēsi bata, ọ bu kwa uzọ-ya ka ọ gēsi pua.
9 Ma mb͕e ndi ala nka gābia n'iru Jehova nime mb͕e di iche iche akara àkà, onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu bata ikpọ isi ala gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida pua; ma onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida bata gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu pua: ọ gaghi-esi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke o siri bata laghachi, kama otù iru ahu ka ọ gāpu.