8 Ma mb͕e onye-isi-unu gābata, uzọ uzọ-nbata nke ọnu-uzọ-ama ahu ka ọ gēsi bata, ọ bu kwa uzọ-ya ka ọ gēsi pua.
9 Ma mb͕e ndi ala nka gābia n'iru Jehova nime mb͕e di iche iche akara àkà, onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu bata ikpọ isi ala gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida pua; ma onye nēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ndida bata gēsi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke Ugwu pua: ọ gaghi-esi uzọ nke ọnu-uzọ-ama nke o siri bata laghachi, kama otù iru ahu ka ọ gāpu.
10 Ma onye-isi, ọ bu n'etiti ha, mb͕e ha nābata, ka o gēso bata; ọzọ, mb͕e ha nāpu, ha gāpu n'otù.
11 Ọzọ, n'ememe nile na nime mb͕e nile akara àkà onyinye-inata-iru-ọma gābu otù ephah otù oke-ehi, otù ephah otù ebulu, ọ gētiye kwa n'umu-aturu onyinye aka-ya, na manu, otù hin otù ephah.
12 Ma mb͕e onye-isi gēdozi àjà-afọ-ofufo, ma ọ bu àjà-nsure-ọku ma-ọbu àjà-udo, iburu Jehova onyinye-afọ-ofufo, agēmeghere ya ọnu-uzọ-ama ahu nke nēche iru n'Iru-anyanwu, ọ gēdozi kwa àjà-nsure-ọku-ya na àjà-udo-ya nile, dika o si eme n'ubọchi-izu-ike: ọ gāpu kwa, ewe mechie ọnu-uzọ-ama mb͕e ọ pusiri.
13 Ọzọ, otù nwa-aturu nke b͕ara otù arọ nke zuru okè ka i gēdozi ibu àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova kwa-ubọchi: kwa-ututu kwa-ututu ka i gēdozi ya.
14 I gēdozi-kwa-ra ya onyinye-inata-iru-ọma kwa-ututu kwa-ututu, otù uzọ n'uzọ isi nke otù ephah, na manu, otù uzọ n'uzọ atọ nke otù hin, iji gwọ utu ọka flour; ọ bu onyinye-inata-iru-ọma anēnye Jehova mb͕e nile n'ukpuru ebighi-ebi.