1 O we me ka m'laghachi rue ọnu-uzọ ulo ahu; ma, le, miri nēsi n'okpuru nbata-uzọ nke ulo ahu n'akuku Iru-anyanwu puta, n'ihi na iru ulo ahu di n'Iru-anyanwu: miri ahu nēsi kwa n'okpuru rùda, site n'akuku aka-nri nke ulo ahu, site n'akuku Ndida nke ebe-ichu-àjà.
2 O we me ka m'si uzọ nke ọnu-uzọ-ama ahu n'akuku Ugwu puta, o we me ka m'ga buruburu n'uzọ di n'èzí rue ọnu-uzọ-ama di n'èzí, n'uzọ nke nēche iru n'Iru-anyanwu; ma le, miri nēsi n'akuku aka-nri rùputa nke-ntà nke-ntà.
3 Mb͕e nwoke ahu puru ga n'Iru-anyanwu jide eriri n'aka-ya, o we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru nkwonkwo-ukwu.
4 O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri, me ka m'gabiga miri ahu, ọ bu miri nke ruru ikperè-ukwu. O we tùa nnù cubit abua na ọgu íri, me ka m'gabiga, ọ bu miri nke ruru úkwù.
5 O we tùa nnù cubit abua na ọgu iri; ọ bu osimiri nke m'nāpughi igabiga: n'ihi na miri ahu etowo eto, buru miri ogwugwu, osimiri nke anāgaghi-agabiga.
6 O we sim, Ì huwo nka, nwa nke madu? O we me ka m'je, ọ we me ka m'laghachi n'usọ osimiri ahu.