Ezikiel 48:16-22 IGBOB

16 Ma ndia gābu ọtùtù-ya; akuku Ugwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, akuku Ndida nnù iri-na-otù na ọgu ise, n'akuku Iru-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise, na akuku Ọdida-anyanwu nnù iri-na-otù na ọgu ise.

17 Ebe-ita-nri ka obodo ahu gēnwe kwa; n'akuku Ugwu ọgu ami iri-na-abua na iri, n'akuku Ndida ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Iru-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri, n'akuku Ọdida-anyanwu ọgu iri-na-abua na iri.

18 Ma nke fọduru n'ogologo-ya, n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, gādi orú nnù ami na nnù ise n'akuku Iru-anyanwu, na orú nnù na nnù ise n'akuku Ọdida-anyanwu: ọ gādi kwa n'akuku àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ; ihe-ọmume-ya gābu-kwa-ra ndi nēfè obodo òfùfè nri.

19 Ọ bu kwa ndi nēfè obodo òfùfè gālu ya ubi, bú ndi sitere n'ebo nile nke Israel.

20 Àjà-nbuli ahu nile gādi orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'ogologo, na orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri n'obosara: ihe nke nwere akuku anọ rara nrata, otú a ka unu gēbuli àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, tiyere ihe-onwunwe nke obodo.

21 Ma nke fọduru gādiri onye-isi, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ nke àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na nke ihe-onwunwe nke obodo, n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri nke àjà-nbuli ahu rue ókè-ala Iru-anyanwu, na n'akuku Ọdida-anyanwu n'iru orú nnù ami uzọ atọ na nnù abua na ọgu iri ahu rue ókè-ala Ọdida-anyanwu, n'akuku òkè nile, ọ gādiri onye-isi: àjà-nbuli ahu, bú òkè nsọ, na ebe nsọ nke ulo Chineke gādi kwa n'etiti ya.

22 Ọzọ, site n'ihe-onwunwe nke ndi Livai, site kwa n'ihe-onwunwe nke obodo, n'etiti ala nke onye-isi nwere, n'etiti ókè-ala Juda na ókè-ala Benjamin, onye-isi gēnwe nke ahu.