26 N'akuku ókè-ala Isaka, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Zebulun, otù òkè.
27 N'akuku ókè-ala Zebulun, site n'akuku Iru-anyanwu rue akuku Ọdida-anyanwu; Gad, otù òkè.
28 Ma n'akuku ókè-ala Gad, n'akuku Ndida, nke nēche iru na Ndida, ókè-ala gēsite ọbuná na Tema rue miri Meribat-kedesh, rue miri-iyi Ijipt, rue oké osimiri uku.
29 Nka bu ala ahu nke unu gēme ka ọ dayere ebo nile nke Israel n'ihe-nketa, ọ bu kwa ndia bu òkè-ha; ọ bu ihe si n'ọnu Onye-nwe-ayi Jehova puta.
30 Ma ndia bu ọpupu obodo Jerusalem nka; n'akuku Ugwu nnù ami iri-na-otù na ọgu ise n'ọtùtù:
31 ọnu-uzọ-ama nile nke obodo gādi ka aha ebo nile nke Israel si di; ọnu-uzọ-ama atọ n'akuku Ugwu: ọnu-uzọ-ama Reuben, otù; ọnu-uzọ-ama Juda, otù; ọnu-uzọ-ama Livai, otù:
32 n'akuku Iru-anyanwu kwa nnù ami iri-na-otù na ọgu ise; na ọnu-uzọ-ama atọ: bú ọnu-uzọ-ama Josef, otù; ọnu-uzọ-ama Benjamin, otù; ọnu-uzọ-ama Dan, otù: