1 Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi mma-agha di nkọ, dika aguba nke ndi nākọpu isi ka i gēwere ya n'onwe-gi, i gēme kwa ka ọ gabiga n'isi-gi na n'afu-ọnu-gi: i gēwere kwa n'onwe-gi ihe-ọtùtù itù atù, ke agiri-isi na afu-ọnu ahu.
2 Otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēji ọku sure n'etiti obodo ahu, mb͕e ubọchi nile nke nnọchigide-n'agha ahu zuru ezu; i gēwere kwa otù uzọ n'uzọ atọ, were mma-agha ahu tie ya buruburu obodo ahu; otù uzọ n'uzọ atọ ka i gēfesara ifufe, ọ bu kwa mma-agha ka M'gāmiputa n'azu ha.
3 I gēweputa kwa n'ebe ahu agiri-isi di ole-na-ole n'ọnu-ọgugu, ke ha n'ọnu-ọnu-ala nke uwe-nwuda-gi.
4 Ọ bu kwa nime ndia ka i gēweputa kwa ufọdu ọzọ, tubà ha n'etiti ọku ahu, sure ha n'ọku; nime ya ka ọku gēsi pukuru ulo Israel nile.
5 Otú a ka Onye-nwe-ayi, bú Jehova, siri: Nka bu Jerusalem: n'etiti mba nile ka M'doworo ya, ala di iche iche di kwa ya buruburu.