18 Ndi Livai nile n'obodo nsọ ahu di ọgu iri-na-anọ na anọ.
19 Ọzọ, ndi-ọnu-uzọ-ama, bú Akub, na Talmon, na umu-nne-ha, ndi nēche nche n'ọnu-uzọ-ama nile, di ọgu asatọ na iri na abua.
20 Ma ndi fọduru nke Israel, na nke ndi-nchu-àjà, na nke ndi Livai, nọ n'obodo nile nke Juda, nwoke ọ bula n'ihe-nketa-ya.
21 Ma Netinim bi n'Ofel: Ziha na Gishpa bu kwa ndi-isi Netinim.
22 Ma onye-nlekọta ndi Livai nime Jerusalem bu Uzi nwa Bani, nwa Hashabaia, nwa Matanaia, nwa Maika, sitere n'umu Esaf, bú ndi-ọbù-abù, onye nēle ije-ozi nke ulo Chineke anya.
23 N'ihi na ihe eze nyere n'iwu di bayere ha, òkè kwesiri ntukwasi-obi di-kwa-ra ndi-ọbù-abù, ihe nke ubọchi n'ubọchi-ya.
24 Petahia nwa Meshezabel, onye sitere n'umu Zera nwa Juda, nọ kwa n'aka eze, ikwuru ndi-Ju okwu ọ bula.