28 Umu nke ndi-ọbù-abù we chikọta onwe-ha, ọbuná site na buruburu-ala nke di Jerusalem buruburu, site kwa n'obodo ntà nile nke ndi Netofa;
29 site kwa na Bet-gilgal, site kwa n'ọhia nile nke Geba na Azmavet: n'ihi na ndi-ọbù-abù wuru obodo ntà nye onwe-ha buruburu Jerusalem.
30 Ndi-nchu-àjà na ndi Livai we me onwe-ha ka ha di ọcha: ha me-kwa-ra ka ndi Israel na ọnu-uzọ-ama nile na mb͕idi di ọcha.
31 M'we me ka ndi-isi Juda rigo n'elu mb͕idi, m'we guzo oké usu abua nke ndi nēkele ekele nēje kwa n'usoro; otù usu we je n'aka-nri n'elu mb͕idi rue ọnu-uzọ-ama nke ebe ikpofu ahihia:
32 Hoshaia we jeso ha, ya na nkera ndi-isi Juda,
33 na Azaraia, na Ezra, na Meshulam,
34 na Juda, na Benjamin, na Shemaia, na Jeremaia,