9 M'we kwue, ha we me ka ime-ulo nile di ọcha: m'we chighachi n'ebe ahu ihe ulo Chineke, ha na onyinye-inata-iru-ọma na frankincense.
10 M'we mata na enyeghi òkè ndi Livai enye; ndi Livai na ndi-ọbù-abù, bú ndi nēje ozi ahu, we b͕alaga, nwoke ọ bula n'ubi-ya.
11 Mu na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si, Gini mere arapuworo ulo Chineke? M'we chikọta ha, guzo ha n'ebe-nguzo-ha.
12 Juda nile we webata otù uzọ n'uzọ iri nke ọka na manya-vine ọhu na manu n'ulo-àkù.
13 M'we me ndi-ulo-àkù ndi gāchi ulo-àkù nile, bú Shelemaia onye-nchu-àjà, na Zedok, bú ode-akwukwọ, na Pedaia, onye sitere na ndi Livai: Hanan nwa Zakua, nwa Matanaia, nọ kwa n'akuku ha: n'ihi na aguru ha na ndi kwesiri ntukwasi-obi, ọlu-ha bu kwa ikère umu-nne-ha òkè.
14 Chinekem, chetam n'ihi nka, ehichapu-kwa-la omume-eberem nile nke m'meworo n'ulo Chinekem, na n'ihe-ndebe-ya nile.
15 Na mb͕e ahu ka m'huru nime Juda ufọdu ndi nāzọcha ebe-nzọcha-nkpuru-vine n'ubọchi-izu-ike, ndi nēbubata kwa obo ọka, nēbo kwa inyinya-ibu; ọzọ kwa, manya-vine, na nkpuru-vine, na fig, na ibu nile ọ bula, ha nēbubata kwa ha nime Jerusalem n'ubọchi-izu-ike: m'we b͕a àmà megide ha n'ubọchi ha nēre ihe-oriri.