22 N'iso ya ka ndi-nchu-àjà, bú ndikom nke Buruburu-ala, mere ka mb͕idi di ike.
23 N'iso ha ka Benjamin na Hashub mere ka mb͕idi di ike na ncherita-iru ulo-ha. N'iso ha ka Azaraia nwa Maaseia nwa Ananaia mere ka mb͕idi di ike n'akuku ulo-ya.
24 N'iso ya ka Binui nwa Henadad mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site n'ulo Azaraia rue nkuku mb͕idi, ọbuná rue ulo-elu nkuku.
25 Palal nwa Uzai mere ka mb͕idi di ike site na ncherita-iru nkuku mb͕idi, na ulo-elu nke nāputa n'ulo di n'elu nke eze, bú nke di nso ogige ulo-nche. N'iso ya ka Pedaia nwa Parosh mere ka mb͕idi di ike.
26 (Ma Netinim nēbi n'Ofel, rue na ncherita-iru ọnu-uzọ-ama miri n'akuku ọwuwa-anyanwu, na ulo-elu nke nāputa aputa.)
27 N'iso ya ka ndi Tekoa mere ka iberibe ọzọ atùru atù di ike, site na ncherita ulo-elu di uku nke nāputa aputa, we rue mb͕idi Ofel.
28 Site n'elu ọnu-uzọ-ama inyinya ka ndi-nchu-àjà mere ka mb͕idi di ike, nwoke ọ bula na ncherita-iru ulo-ya.