1 Oké iti-nkpu nke ndi-ayi na ndinyom-ha we di megide umu-nne-ha, bú ndi-Ju.
2 N'ihi na ufọdu di ndi nāsi, Ayi onwe-ayi, na umu-ayi ndikom, na umu-ayi ndinyom, di ọtutu: kwe ka ayi nara ọka, ka ayi we rie ihe, we di ndu.
3 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile na ulo-ayi nile ka ayi nēdo n'ibé: kwe ka ayi nara ọka, n'ihi oké unwu a.
4 Ufọdu di kwa ndi nāsi, Ayi ewerewo ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile biri ego itu utu-ala eze.
5 Ma ub͕u a dika anu-aru umu-nne-ayi ka anu-aru-ayi di, dika umu-ha ka umu-ayi di: ma, le, ayi onwe-ayi nāzọda umu-ayi ndikom na umu-ayi ndinyom ime ka ha buru ndi-orù, ufọdu di kwa n'etiti umu-ayi ndinyom ndi azọdaworo azọda: ma ayi enweghi ike nke aka-ayi; ma ndi ọzọ nwe ubi-ayi nile na ubi-vine-ayi nile.
6 Iwem we di ọku nke-uku mb͕e m'nuru iti-nkpu-ha na okwu ndia.
7 Obim we duam ọdu, mu na ndi amara aha-ha na ndi nọchiri anya eze we se okwu, m'we si ha, Ọmuru-nwa ka unu onwe-unu nānara, nwoke ọ bula n'aka nwa-nne-ya. M'we nwe nkpọkọta uku megide ha.