16 O rue, mb͕e ndi-iro-ayi nile nuru ya, na mba nile nke di ayi buruburu turu egwu, we da ada nke-uku n'anya nke aka ha: ha we mara na esitere n'aka Chineke-ayi je ozi a.
17 Ọzọ, na mb͕e ahu ndi Juda amara aha-ha nēzigara Tobaia ọtutu akwukwọ-ozi, akwukwọ-ozi nke Tobaia nābiaru kwa ha aka.
18 N'ihi na ọtutu madu di nime Juda ndi nwere iyi ha ṅuru ya, n'ihi na di nwa-nwayi Shekania nwa Ara ka ọ bu; Jehohanan nwa-ya lu-kwa-ra nwa-nwayi Meshulam nwa Berekaia na nwunye.
19 Ha nēkwu kwa okwu bayere ezi omume-ya nile n'irum, ha nēburu kwa okwum nile pukuru ya. Akwukwọ-ozi ka Tobaia ziri ime ka m'tua egwu.