Nehemaia 9:25-31 IGBOB

25 Ha we were obodo di iche iche ewusiri ike, na ala nwere ume, ha nweta-kwa-ra ulo juputara n'ezi ihe nile, na olùlù-miri egwuwara egwuwa, na ubi-vine, na ubi-olive, na ọtutu osisi nāmi nkpuru anēri eri: ha we rie ihe, afọ ju-kwa-ra ha, ha we gba abuba, ezi ihe uku Gi we tọ ha utọ.

26 Ma ha juru Gi aju, nupu isi megide Gi, tufue iwu-Gi n'azu ha, b͕ue ndi-amuma-Gi ndi b͕ara àmà megide ha ime ka ha chigharikute Gi, ha we me oké ihe-nlelì.

27 I we nye ha n'aka ndi nākpab͕u ha, ha we kpab͕ue ha: ma na mb͕e nkpab͕u-ha, ha we tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, nye ha ndi-nzọputa dika ọtutu obi-ebere-Gi nile si di, ha we zọputa ha n'aka ndi nākpab͕u ha.

28 Ma mb͕e izu-ike diri ha, ha me-kwa-ra ihe ọjọ n'iru Gi ọzọ: I we rapu ha n'aka ndi-iro-ha, ha we nwe ike n'aru ha: ha we laghachi, tikue Gi, Gi onwe-gi we site n'elu-igwe nu, naputa ha ọtutu ub͕ò dika obi-ebere-Gi si di,

29 I we b͕a àmà megide ha, ime ka ha lata n'iwu-Gi: ma ndi ahu mere ihe na nganga, ha egeghi kwa nti ihe nile I nyere n'iwu, kama ha mehiere megide ikpé-Gi nile, (nke madu nēme nādi kwa ndu nime ha,) ha we wezuga ubu-ha, kwesie olu-ha ike, ha anughi kwa.

30 Ma I nēme ka ọtutu arọ di ogologo n'isi ha, I we were Mọ-Gi b͕a àmà megide ha site n'aka ndi-amuma-Gi: ma ha aṅaghi nti: I we nye ha n'aka ndi di iche iche nke ala ọzọ.

31 Ma n'ọtutu obi-ebere-Gi I meghi ka ha gwusia, I rapughi kwa ha; n'ihi na Chineke Nke nēme amara, Nke nwe kwa ra obi-ebere, ka I bu.