3 Ha we bilie n'ebe-nguzo-ha, gua n'akwukwọ iwu Jehova, bú Chineke-ha, otù uzọ n'uzọ anọ nke ubọchi; otù uzọ n'uzọ anọ kwa ka ha nēkwuputa, nākpọ kwa isi ala nye Jehova, bú Chineke-ha.
4 Jeshua, na Bani, na Kadmiel, na Shebania, na Buni, na Sherebia, na Bani, na Kenani, we bilie n'elu ihe-nrigo ndi Livai, were oké olu tikue Jehova, bú Chineke-ha.
5 Ndi Livai, bú Jeshua, na Kadmiel, na Bani, na Hashabneia, na Sherebia, na Hodia, na Shebania, na Petahia, we si, Bilienu, gọzie Jehova, bú Chineke-unu, site na mb͕e edighi-ebi rue mb͕e ebighi-ebi: ka ha gọzi kwa aha-Gi di nsọpuru, nke ebuliworo ya elu kari ngọzi na otuto nile.
6 Gi onwe-gi bu Jehova, nání Gi; Gi onwe-gi emewo elu-igwe, bú elu-igwe nke elu-igwe nile, na usu-ha nile, na uwa na ihe nile nke di n'elu ya, na oké osimiri nile na ihe nile nke di nime ha, Gi onwe-gi nēdebe kwa ha nile ndu; usu ihe elu-igwe nākpọ kwa isi ala nye Gi.
7 Gi onwe-gi, Jehova, bu Chineke ahu Nke rọputara Abram, me ka o si na Ua nke ndi Kaldea puta, I gu-kwa-ra aha-ya Abraham;
8 I hu-kwa-ra na obi-ya kwesiri ntukwasi-obi n'iru Gi, Gi na ya b͕a-kwa-ra ndu na I gēwere ala nke ndi Kenean na ndi Het na ndi-Amorait na ndi Perizait na ndi Jebus na ndi-Giagashait nye, bú iwere ya nye nkpuru-ya, I we me ka okwu-Gi guzosie ike; n'ihi na onye ezi omume ka I bu.
9 I hu-kwa-ra mweda-n'ala nke nna-ayi-hà n'Ijipt, nu kwa iti-nkpu-ha n'akuku Oké Osimiri Uhie;