1 Ma ndia bu aha umu-ndikom Israel, ndi batara n'Ijipt; ha soro Jekob bata, nwoke ọ bula na ulo-ya.
2 Reuben, na Simeon, na Livai, na Juda;
3 Isaka, na Zebulun, na Benjamin;
4 Dan, na Naftali, na Gad, na Asha.
5 Madu nile ndi si n'úkwù Jekob puta di kwa ọgu madu atọ na iri: ma Josef, ọ nọri n'Ijipt.
6 Josef we nwua, ya na umu-nne-ya nile, na ọb͕ọ ahu nile.
7 Ma umu Israel muru ọmùmù, ri nne, ba uba, we nwe ume nke uku; ala ahu we juputa na ha.