Ọpupu 25 IGBOB

1 Jehova we gwa Moses okwu, si,

2 Gwa umu Israel ka ha wetara m àjà-nbuli: n'aka nwoke ọ bula nke obi-ya nēme ya ka ọ nwe afọ-ofufo ka unu gānara àjà-nbulim.

3 Nka bu kwa àjà-nbuli ahu nke unu gānara n'aka ha; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;

4 na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;

5 na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;

6 na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ me;

7 na nkume onyx, na nkume di iche iche ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.

8 Ka ha me-kwa-ram ebe nsọ; ka M'we biri n'etiti ha.

9 Dika ihe nile Mu onwem nēme ka i hu, bú ihe-atù nke ebe-obibim, na ihe-atù nke ihe-ya nile, ọbuná otú a ka unu gēme ya.

10 Ha gēme kwa ib͕e osisi acacia: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.

11 I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, nime na azu ka i gāmachita ya, i gēme kwa mpempe ọla-edo n'elu-ya buruburu.

12 I gāwu-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye ha n'ukwu anọ ya; bú nb͕a-aka abua n'otù akuku-ya, na nb͕a-aka abua n'akuku-ya ọzọ.

13 I gēme kwa nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla-edo.

14 I gēme kwa ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu n'elu akuku ib͕e ahu, iwere ha nēbu ib͕e ahu.

15 Nime nb͕a-aka nke ib͕e ahu ka nkpa-n'aka ahu ganādi: agaghi-ewepu ha nime ya.

16 I gētiye kwa n'ib͕e ahu ihe-àmà M'gēnye gi.

17 I gēme kwa ebe-nkpuchi-nmehie nke ọla-edo anāgwaghi agwa: cubit abua na nkera ka ogologo-ya gādi, otù cubit na nkera ka obosara-ya gādi.

18 I gēme kwa cherubim ọla-edo abua; ihe akpuru akpu ka i gēme ha, na nsọtu abua nke ebe-nkpuchi-nmehie.

19 Gi me otù cherub n'otù nsọtu, na otù cherub na nsọtu nke-ọzọ: site n'ebe-nkpuchi-nmehie ka unu gēme cherubim ahu n'elu nsọtu-ya abua.

20 Cherubim ahu ganāb͕asa kwa nkù-ha n'elu, nēkpuchi ebe-nkpuchi-nmehie na nkù-ha, iru-ha nēcherita kwa onwe-ha; n'ebe ebe-nkpuchi-nmehie di ka iru cherubim ahu gādi.

21 I gātukwasi kwa ebe-nkpuchi-nmehie ahu n'ib͕e ahu, n'elu ya; nime ib͕e ahu ka i gētiye ihe-àmà nke M'gēnye gi.

22 M'gēzute kwa gi n'ebe ahu, kpayere gi uka site n'elu ebe-nkpuchi-nmehie, site n'etiti cherubim abua nke di n'elu ib͕e ihe-àmà ahu, bayere ihe nile nke M'gēnye gi n'iwu n'ebe umu Israel nọ.

23 I gēme kwa table osisi acacia: cubit abua ka ogologo-ya gādi, otù cubit ka obosara-ya gādi, otù cubit na nkera ka idi-elu-ya gādi.

24 I gāmachita kwa ya ọla-edo anāgwaghi agwa, me-kwa-ra ya mpempe ọla-edo buruburu.

25 I gēme-kwa-ra ya ihe-njikọ buruburu nke ra ka otù ọbu-aka, i gēme-kwa-ra ihe-njikọ-ya mpempe ọla-edo buruburu.

26 I gēme-kwa-ra ya nb͕a-aka ọla-edo anọ, tiye nb͕a-aka ahu na nkuku ano nke di n'ukwu anọ ya.

27 Na nso ihe-njikọ ahu ka nb͕a-aka gādi, ka ha buru ọnọdu itiye nkpa-n'aka eji ebu table ahu.

28 I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo, agēji ha ebu table.

29 I gēme kwa afere-ya nile, na ngaji-ya nile, na iko-ya nile, na ọkwa-ya nile, nke eji awusi àjà-ihe-ọṅuṅu: ọla-edo anāgwaghi agwa ka i gēwere me ha.

30 I gādọba kwa achicha nke iru Chineke n'elu table ahu n'irum mb͕e dum.

31 I gēme kwa ihe-idọba-oriọna nke ọla-edo anāgwaghi agwa: ihe akpuru akpu ka agēme ihe-idọba-oriọna ahu, bú ukwu-ala-ya, na alaka-ya; iko-ya nile, bú isi-ya nile, na okoko-ya nile, gēsite na ya:

32 alaka isi ganēsi n'akuku-ya abua waputa; alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu n'otù akuku-ya, alaka atọ nke ihe-idọba-oriọna ahu kwa n'akuku-ya nke-ọzọ:

33 iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi n'otù alaka, otù isi na otù okoko; iko atọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n'alaka-ibe-ya, otù isi na otù okoko: otú a ka ọ gādiri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna ahu waputa:

34 iko anọ emere dika ifuru osisi almond gādi kwa n'ihe-idọba-oriọna ahu, isi-ha na okoko-ha:

35 otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, otù isi gādi kwa n'okpuru alaka abua site na ya, diri alaka isi ahu nke nēsi n'ihe-idọba-oriọna waputa.

36 Isi-ha alaka-ha gēsite na ya; ihe-idọba-oriọna ahu nile gābu otù ihe eji ọla-edo nke anāgwaghi agwa kpu.

37 I gēme kwa oriọna-ya, ha gādi asa: ha gēweli kwa oriọna-ya nile, ka ọ we nye ìhè na ncherita-iru ya.

38 Nkpa-ya nile na ihe-ikpakepu-ọku-ya nile gābu ọla-edo anāgwaghi agwa.

39 Otù talent nke ọla-edo anāgwaghi agwa ka agēji ma ya, ya na ihe ndia nile.

40 Ma le anya ka i me ha dika ihe-atù-ha si di, nke anēme ka gi onwe-gi hu n'ugwu a.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40