Ọpupu 24 IGBOB

1 Moses ka Ọ siri, Rigokute Jehova, gi onwe-gi, na Eron, na Nedab, na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye ndi Israel; unu gākpọ kwa isi ala n'ebe di anya:

2 ma nání Moses onwe-ya gābiakute Jehova nso; ma ha onwe-ha agaghi-abiaru nso; ndim agaghi-eso kwa ya rigota.

3 Moses we bia, kọrọ ndi Israel okwu Jehova nile, na ikpé-Ya nile; ndi Israel nile we za n'otù olu, si, Okwu nile Jehova kwuworo, ayi gēme ha.

4 Moses we de okwu Jehova nile n'akwukwọ, o bilie n'isi-ututu, wu ebe-ichu-àjà n'okpuru ugwu ahu, ya na ogidi iri na abua, dika ebo iri na abua nke Israel si di.

5 O zie umu-okorọbia nke umu Israel, ha we sure àjà-nsure-ọku, chiri kwa oke-ehi chuara Jehova àjà, bú àjà-udo.

6 Moses we were nkera ọbara-ha, tiye n'ọkwa di iche iche; nkera ọbara-ha ka ọ wusara n'ebe-ichu-àjà.

7 Ọ were akwukwọ ọb͕ub͕a-ndu ahu, gua ya na nti ndi Israel: ha we si, Ihe nile Jehova kwuworo, ayi gēme ya, nu kwa.

8 Moses we were ọbara ahu, wusa ya n'aru ndi Israel, si, Le, ọbara nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, nke Jehova b͕aworo n'ebe unu nọ bayere okwu ndia nile.

9 Moses we rigo, ya na Eron na Nedab na Abaihu, na ọgu madu atọ na iri sitere na ndi-okenye nke Israel:

10 ha we hu Chineke nke Israel; ma n'okpuru ukwu-Ya abua ọ di ka pavement eji nkume sapphire me, ọ di kwa ka elu-igwe onwe-ya n'idi-ọcha.

11 Ma Ọ setipughi aka-Ya megide ndi ahu arọputara n'etiti umu Israel: ha we hu Chineke anya, rie ihe, ṅu kwa ihe-ọṅuṅu.

12 Jehova we si Moses, Rigokutem rue ugwu a, nọ kwa n'ebe ahu: ka M'nye kwa gi nkume abua ahu di mbadamba, na iwum, na ihe M'nyere n'iwu, bú nke M'deworo, ka i we zí ha.

13 Moses we bilie, ya na Joshua onye nējere ya ozi: Moses we rigo n'ugwu nke Chineke.

14 Ma ndi-okenye Israel ka ọ siri, Nọdunu n'ebe a nēche ayi, rue mb͕e ayi gālaghachikute unu: ma, le, Eron na Hua nọ n'etiti unu: onye nwere okwu, ya biakute ha nso.

15 Moses we rigo n'ugwu ahu, igwe-oji ahu we kpuchie ugwu.

16 Ebube Jehova biri n'elu ugwu Sainai, igwe-oji ahu nēkpuchi kwa ya ubọchi isi: O si n'etiti igwe-oji ahu kpọ Moses òkù n'ubọchi nke-asa.

17 Ma nile ebube Jehova anya, ọ di ka ọku nērichapu n'elu ugwu ahu n'anya umu Israel.

18 Moses we ba n'etiti igwe-oji ahu, rigorue ugwu ahu: Moses we nọ n'ugwu ahu ọgu ubọchi abua ehihie na abali.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40