Ọpupu 29 IGBOB

1 Nka bu kwa ihe i gēme ha ido ha nsọ, ka ha we burum ndi-nchu-àjà: were otù nwa-oke-ehi na ebulu abua nke zuru okè,

2 na achicha ekoghieko, na ob͕e achicha ufọdu ekoghieko nke agwara manu, na mbadamba-achicha ufọdu ekoghi-eko nke etere manu: utu flour nke ọka wheat ka i gēwere me ha.

3 I gētiye ha n'otù nkata, bute ha nso nime nkata ahu, ha na oke-ehi ahu na ebulu abua ahu.

4 Eron na umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute, i gēwere miri sa ha aru.

5 I gāchiri kwa uwe ahu, yikwasi Eron uwe-ime, na uwe-nwuda ephod, na ephod, na ihe-ib͕ochi-obi, were kwa ihe-ọkiké nke ephod nke onye-ọ̀kà kpara ke ya:

6 i gēkpukwasi kwa akwa nkechi ahu n'isi-ya, tiye okpu nsọ nke onye-nchu-àjà n'elu ákwà-nkukù-isi ahu.

7 I gēwere kwa manu otite-manu ahu wukwasi n'isi-ya, we te ya.

8 Umu-ya ndikom ka i gēme kwa ka ha biarue nso, i gēyikwasi ha uwe-ime.

9 I gēwere kwa ihe ike n'úkwù ke ha, bú Eron na umu-ya ndikom, i gēke kwa ha ihe ike n'isi: ha gēnwe kwa ọlu nchu-àjà site n'ukpuru ebighi-ebi: i gēmeju kwa aka Eron na aka umu-ya ndikom.

10 I gākputa kwa oke-ehi ahu nso n'iru ulo-ikwū nzute: Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n'isi oke-ehi ahu.

11 I gēb͕u kwa oke-ehi ahu n'iru Jehova, n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

12 I gēwere ufọdu nime ọbara oke-ehi ahu, tiye n'elu mpì nile nke ebe-ichu-àjà na nkpisi-aka-gi: ọ bu kwa ọbara nile ka i gāwusi na ntọ-ala ebe-ichu-àjà.

13 I gēwere kwa abuba nile nke nēkpuchi ihe-ime, na mba-imeju nke di n'imeju, na akọrọ abua, na abuba nke di n'elu ha, sure ha ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà.

14 Ma anu oke-ehi ahu, na akpukpọ-ya, na nsi-ya, i gēsure ya n'ọku n'azu ọmuma-ulo-ikwū-unu: àjà-nmehie ka ọ bu.

15 Otù nime ebulu abua ahu ka i gēwere kwa; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi aka-ha n'isi ebulu ahu.

16 I gēb͕u ebulu ahu, were ọbara-ya, wusa n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.

17 I gābọ kwa ebulu ahu n'ọbubọ-ya, sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, tiye ha n'elu ọbubọ-ya, na n'elu isi-ya.

18 I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.

19 I gēwere kwa ebulu nke-ọzọ; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi kwa aka-ha n'isi ebulu ahu.

20 I gēb͕u kwa ebulu ahu, were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'ọnu-ọnu nti aka-nri umu-ya ndikom, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha, wusa kwa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.

21 I gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, na ufọdu nime manu nke otite-manu ahu, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya: ọ gādi kwa nsọ, ya onwe-ya, na uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom tiyere ya.

22 I gēsi kwa n'ebulu ahu were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba nke di n'elu ha, na utaku-ukwu aka-nri-ya; n'ihi na ebulu nke nmeju-aka ka ọ bu:

23 na otù ob͕e achicha, na otù ob͕e achicha agwara manu, na otù mbadamba-achicha, site na nkata achicha ekoghi-eko ahu nke di n'iru Jehova:

24 i gātukwasi ha nile n'ọbu-aka abua nke Eron, na n'ọbu-aka nke umu-ya ndikom, fé kwa ha ka ha buru àjà-ofufé n'iru Jehova.

25 I gānara kwa ha n'aka-ha, sure ha ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà n'elu àjà-nsure-ọku ahu, ka ha buru ihe ísì utọ n'iru Jehova: àjà-ọku anāchuru Jehova ka ọ bu.

26 I gēsi kwa n'ebulu nke nmeju-aka nke diri Eron were okpukpu-obi-ya, fé ya ka ọ buru àjà-ofufé n'iru Jehova: ọ gābu kwa òkè i nwere.

27 I gēdo kwa okpukpu-obi nke àjà-ofufé nsọ, ya na utaku-ukwu nke àjà-nbuli, nke anēfé, na nke anēbuli, site n'ebulu nke nmeju-aka ahu, bú site na nke diri Eron, site kwa na nke diri umu-ya ndikom:

28 ọ gābu kwa ihe Eron na umu-ya ndikom gēnwe dika ukpuru mb͕e ebighi-ebi sitere n'aka umu Israel: n'ihi na àjà-nbuli ka ọ bu: àjà-nbuli ka ọ gābu kwa sitere n'aka umu Israel, site n'ihe àjà nile nke àjà-udo-ha, bú àjà-nbuli-ha anēbuliri Jehova.

29 Uwe nsọ Eron nwere gādiri umu-ya ndikom ndi gānọchi ya, ka ewe te ha manu nime ha, meju kwa aka-ha nime ha.

30 Ubọchi asa ka o gēyiri ha, bú onye-nchu-àjà ahu nke gānọchi ya site n'umu-ya ndikom, mb͕e ọ nābà n'ulo-ikwū nzute ije ozi n'ebe nsọ ahu.

31 Ma ebulu nke nmeju-aka ahu, i gēwere ya sie anu-ya n'ebe di nsọ.

32 Eron na umu-ya ndikom gēri kwa anu ebulu ahu, na achicha nke di na nkata ahu, n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute.

33 Ha gēri kwa ha, bú ihe eji kpuchi nmehie, imeju aka-ha na ido ha nsọ: ma onye ala ọzọ agaghi-eri ha, n'ihi na nsọ ka ha di.

34 Ma ọ buru na ihe afọdu site n'anu nke nmeju-aka ahu, ma-ọbu site n'achicha, rue ututu, i gēsure kwa ihe fọduru n'ọku: agaghi-eri ya, n'ihi na nsọ ka ọ di.

35 I gēme kwa Eron, me kwa umu-ya ndikom, otú a, dika ihe nile si di nke M'nyeworo gi n'iwu: ubọchi asa ka i gēmeju aka-ha.

36 Oke-ehi nke àjà-nmehie ka i gāchu kwa bayere nkpuchi-nmehie kwa-ubọchi: i gēwepu kwa nmehie n'ebe-ichu-àjà ahu mb͕e i nēkpuchi nmehie n'elu ya; i gēte kwa ya manu, ido ya nsọ.

37 Ubọchi asa ka i gēkpuchi nmehie n'elu ebe-ichu-àjà ahu, we do ya nsọ: ebe-ichu-àjà ahu gābu kwa ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile: ihe ọ bula nke nēmetu ebe-ichu-àjà ahu aru gādi nsọ.

38 Ma nka bu ihe i gāchu n'elu ebe-ichu-àjà ahu; umu-aturu abua, nke b͕ara otù arọ, kwa-ubọchi mb͕e dum.

39 Otù nime umu-aturu ahu ka i gāchu n'ututu; chu kwa nwa-aturu nke-ọzọ n'etiti ehihie na anyasi:

40 otù uzọ n'uzọ iri nke otù ephad utu oka flour agwara n'otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manu asuru asu gādiri otù nwa-aturu ahu; ya na otù uzọ n'uzọ anọ nke otù hin nke manya-vine, ka ọ buru àjà-ihe-ọṅuṅu.

41 Nwa-aturu nke-ọzọ ka i gāchu kwa n'etiti ehihie na anyasi; dika onyinye-inata-iru-ọma enyere n'ututu, na dika àjà-ihe-ọṅuṅu-ya, otú a ka i gēme ya, ka ọ buru ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova.

42 Ọ gābu àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile n'ọnu-uzọ nke ulo-ikwū nzute n'iru Jehova: ebe M'gēzute unu, igwa gi okwu n'ebe ahu.

43 M'gēzute kwa umu Israel n'ebe ahu; anēji kwa ebubem do Ulo-ikwū ahu nsọ.

44 M'gēdo kwa ulo-ikwū nzute nsọ, ya na ebe-ichu-àjà ahu: Eron na umu-ya ndikom ka M'gēdo kwa nsọ, iburum ndi-nchu-àjà.

45 M'gēbi kwa n'etiti umu Israel, M'gābu-kwa-ra ha Chineke.

46 Ha gāmara kwa na Mu onwem bu Jehova Chineke-ha, Nke mere ka ha si n'ala Ijipt puta, ka M'we biri n'etiti ha: Mu onwem bu Jehova Chineke-ha.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40