Ọpupu 15 IGBOB

1 Mb͕e ahu Moses na umu Israel nābukuru Jehova abù a, ha kwue, si,Ka m'bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku:Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.

2 Ikem na abù ọmam ka Ja bu,Ọ we ghọrọm nzọputa:Onye a bu Chinekem, m'gēme kwa Ya ka Ọ di elu;Chineke nke nnam, m'gēweli kwa Ya elu.

3 Jehova bu onye-agha:Jehova bu aha-Ya.

4 Ub͕ọ-ala Fero nile na usu-ndi-agha-ya ka O tufuworo n'oké osimiri:Ndi-isi-agha-ya arọputara arọputa, ha emikpuwo emikpu n'Oké Osimiri Uhie.

5 Ob͕u-miri nēkpuchi ha:Ha aridawo na miri di omìmì dika nkume.

6 Jehova, aka-nri-Gi, nke di ebube n'ike,Jehova, aka-nri-Gi nētipia onye-iro.

7 N'idi-ọtutu nke nbili-elu-Gi ka I nākwada ndi nēbili megide Gi:I nēzipu iwe-Gi di ọku, o richapu ha dika ahihia-ọka.

8 Ewere iku-ume nke oghere-imi-Gi me ka miri tua obo,Nrurù-miri guzoro onwe-ha ọtọ dika obo;Ob͕u-miri raruru aruru n'obi oké osimiri.

9 Onye-iro siri,M'gāchu, m'gēru ha aru, m'gēkesa ihe m'kwatara:Nkpuru-obim gējuputa na ha,M'gāmipu mma-agham, akam gā-napu ha ihe nile.

10 I were ifufe-Gi fe, oké osimiri kpuchiri ha:Ha mikpuru dika opù nime miri di ebube.

11 Ònye di ka Gi n'etiti chi nile, Jehova?Ònye di ka Gi, di ebube n'idi-nsọ?Onye anātu egwu n'otuto nile, nēme ihe-ebube di iche iche.

12 I setiri aka-nri-Gi,Ala elo ha.

13 N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.

14 Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.

15 Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.

16 Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha;N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume;Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova,Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.

17 I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi,Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova,Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike.

18 Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.

19 N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri.

20 Miriam, bú nwayi-amuma, bú nwa-nne-nwayi Eron, we were egwú-otiti n'aka-ya; ndinyom nile we chiri egwú-otiti na ite-egwú soro ya pua.

21 Miriam we za ha, si,Unu bukue Jehova abù, n'ihi na O biliwo elu nke-uku;Inyinya na onye o nēbu, Ọ tubàwo ha n'oké osimiri.

22 Moses we me ka Israel si n'Oké Osimiri Uhie bulie ije, ha we pua ba n'ọzara Shua; ha we je ije ubọchi atọ n'ọzara ahu, ma ha achọtaghi miri.

23 Ha we biarue Mara, ma ha apughi iṅu miri nke Mara, n'ihi na ilu ka ha di: n'ihi nka akpọrọ aha-ya Mara.

24 Ndi Israel we tamu ntamu megide Moses, si, Gini ka ayi gāṅu?

25 Ọ we tikue Jehova; Jehova we me ka ọ hu otù osisi, ọ tubà ya na miri ahu, miri ahu we di utọ. N'ebe ahu ka O doro ukpuru na ikpé nye ha, ọ bu kwa n'ebe ahu ka Ọ nwara ha;

26 si, Ọ buru na i ge nti nke-ọma n'olu Jehova, bú Chineke-gi, ọ buru kwa na i me ihe nke ziri ezi n'anya-Ya, ọ buru kwa na i ṅa nti n'ihe Ọ nyere n'iwu, ọ buru kwa na i debe ukpuru-Ya nile, ọ dighi ọria ọ bula nke M'tiyere n'aru ndi Ijipt M'gētiye n'aru gi: n'ihi na Mu onwem bu Jehova Nke nēme ka aru di gi nma.

27 Ha biarue Ilim, ebe isi-iyi iri na abua na ọgu nkwu atọ na iri di: ha we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'akuku miri.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40