Ọpupu 5 IGBOB

1 Emesia Moses na Eron biara, si Fero, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Israel, nāsi, Zipu ndim, ka ha we merem ememe n'ọzara.

2 Fero we si, Ònye bu Jehova, na m'gēge nti n'olu-Ya izipu Israel? amaghm Jehova, ọzọ kwa, m'gaghi-ezipu Israel.

3 Ha si, Chineke nke ndi-Hibru ezutewo ayi: biko, ka ayi je ije nke ubọchi atọ n'ọzara, chuara Jehova, bu Chineke-ayi, aja: ka Ọ we ghara iwere ajọ ọria nēfe efe, ma-ọbu mma-agha, zute ayi.

4 Eze Ijipt we si ha, N'ìhi gini ka unu, bú Moses na Eron, nēme ka ndi ahu rapu ọlu-ha nile? jenu ibu-unu.

5 Fero si-kwa-ra, Le, ọtutu ka ndi ala nka di ub͕u a, unu nēme kwa ka ha kwusi n'ibu ibu nile ha.

6 N'ubọ-chi ahu Fero we nye ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike na ndi nēle ha anya n'ọlu iwu, si,

7 Unu enye-kwa-la ndi ahu okporo-ọka ọzọ ikpu brick, dika na mb͕e gara aga: ha onwe-ha gēje chikọtara onwe-ha okporo-ọka.

8 Ọnu-ọgugu brick, nke ha onwe-ha nākpu na mb͕e gara aga, ka unu gātukwasi ha; unu agubìla ihe nime ya: n'ihi na ndi-ume-ngwu ka ha bu; n'ihi ya ka ha onwe-ha nēti nkpu, si, Ka ayi je, chuara Chineke-ayi àjà.

9 Ka òfùfè-ha di arọ́ n'aru ndikom ahu, ka ha we lua ọlu nime ya; ha ele-kwa-la okwu-ugha anya ọma.

10 Ndi nāchi ndi Israel n'ihe-ike we pua, ha na ndi nēle ha anya n'ọlu, ha we gwa ndi ahu okwu, si, Otú a ka Fero siri, M'gaghi-adi nēnye unu okporo-ọka.

11 Unu onwe-unu je, werenu okporo-ọka n'onwe-unu n'ebe ọ bula unu gāchọta ya, n'ihi na ọ dighi ihe agāgubì n'òfùfè-unu.

12 Ndi Israel we b͕asa n'ala Ijipt nile ichikọta ahihia-ọka n'ọnọdu okporo-ọka.

13 Ndi nāchi ha n'ihe-ike nēme ngwa, si, Luzeunu ọlu-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya, dika mb͕e okporo-ọka di.

14 Ewe tie ha ihe, bú ndi nēle umu Israel anya n'ọlu, nke ndi Fero ndi nāchi umu Israel n'ihe-ike doro isi-ha, ewe si ha, Gini mere unu aluzughi òkè-unu ma nyahuru ma ta, n'ikpu brick dika na mb͕e gara aga?

15 Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we bia tikue Fero, si, N'ìhi gini ka i nēme ndi-orù-gi otú a?

16 Ọ dighi okporo-ọka anēnye ndi-orù-gi, ma ha nāsi ayi, Kpuanu brick: le kwa, anēti ndi-orù-gi ihe; ma ndi nke gi emehiewo.

17 Ma ọ siri, Ndi-ume-ngwu ka unu bu, ndi-ume-ngwu ka unu bu: n'ihi nka ka unu onwe-unu nāsi, Ka ayi je, chuara Jehova àjà.

18 Ma ub͕u a, jenu, fè òfùfè; n'ihi na agaghi-enye unu okporo-ọka, ma ọnu-ọgugu brick-unu ka unu gēnye.

19 Ndi nēle umu Israel anya n'ọlu we hu ha na ha nọ n'ọnọdu ọjọ mb͕e anāsi, Unu agubìla ihe nime brick-unu, ọlu nke ubọchi n'ubọchi-ya.

20 Ha we zute Moses na Eron, ndi nēguzo onwe-ha izute ha, mb͕e ha si n'ebe Fero nọ puta:

21 ha si ha, Jehova lekwasi unu anya, kpe ikpe: n'ihi na unu emewo ka ísì-ayi sì ísì ọjọ n'anya Fero, na n'anya ndi-orù-ya, itiye mma-agha n'aka-ha ib͕u ayi.

22 Moses we laghachikuru Jehova, si, Onye-nwe-ayi, n'ìhi gini ka I mejọworo ndi nka? ọ̀ bu n'ihi gini bu nka na I zitewom?

23 Ma site na mb͕e m'biakutere Fero ikwu okwu n'aha-Gi, ọ mejọwo ndi nka; I naputaghi kwa ndi-Gi ma-ọli.

isiakwụkwọ

1 2 3 4 5 6 7 8 9 10 11 12 13 14 15 16 17 18 19 20 21 22 23 24 25 26 27 28 29 30 31 32 33 34 35 36 37 38 39 40