13 N'ebere-Gi ka I duworo ndi nke I b͕aputaworo:N'ike-Gi ka I duworo ha nwayọ rue ebe-obibi-Gi di nsọ.
14 Ndi ọzọ anuwo, ha ama jijiji:Ihe-nb͕u eb͕uwo ndi bi na Filistia.
15 Mb͕e ahu ka obi lọrọ ndi-isi Edom miri:Ebulu nke Moab, ọma-jijiji nējide ha:Ndi nile bi na Kenean ab͕azewo.
16 Oké ujọ na oké egwù nādakwasi ha;N'idi-uku nke ogwe-aka-Gi ha nọ jū dika nkume;Rue mb͕e ndi-Gi gāgabiga, Jehova,Rue mb͕e ndi nke I nwetara gāgabiga.
17 I gēme ka ha bata, I gāku kwa ha n'ugwu nke ihe-nketa-Gi,Bú ọnọdu guzosiri ike I meworo, ka ọ we buru ebe I gēbi, Jehova,Ebe di nsọ, Onye-nwe-ayi, nke aka-Gi abua meworo ka o guzosi ike.
18 Jehova gābu eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.
19 N'ihi na inyinya nile nke Fero, ha na ub͕ọ-ala-ya nile na ndi-inyinya-ya, bara nime oké osimiri, Jehova we me ka miri nke oké osimiri lata n'aru ha; ma umu Israel jere ije n'elu ala-akọrọ n'etiti oké osimiri.