5 O gēru kwa, n'ubọchi nke-isi, na ha gēdozi ihe nke ha nāchibata, ọ gēme kwa okpukpu abua nke ha nāchikọta kwa-ubọchi.
6 Moses na Eron we si umu Israel nile, n'anyasi ka unu gāmara na Jehova emewo ka unu si n'ala Ijipt puta:
7 n'ututu ka unu gāhu kwa ebube nke Jehova; ebe Ọ nānu ntamu nile unu nātamu megide Jehova: ma àyi onwe-ayi bu gini, na unu nātamu ntamu megide ayi?
8 Moses we si, Nka gābu mb͕e Jehova gēnye unu anu n'anyasi ka unu rie, mb͕e Ọ gēnye kwa unu nri n'ututu ka unu riju afọ; ebe Jehova nānu ntamu unu onwe-unu nātamu megide Ya: ma àyi onwe-ayi bu gini? ha abughi imegide ayi, bú ntamu unu nātamu, kama imegide Jehova.
9 Moses we si Eron, Si nzukọ nile nke umu Israel, Biarunu nso n'iru Jehova: n'ihi na Ọ nuwo ntamu nile unu.
10 O rue, mb͕e Eron nāgwa nzukọ nile nke umu Israel okwu, na ha chere ọzara iru, ma, le, ahuru ebube Jehova n'igwe-oji ahu.
11 Jehova we gwa Moses okwu, si,