1 N'ọnwa nke-atọ mb͕e umu Israel putasiri n'ala Ijipt, n'ubọchi ahu ka ha batara n'ọzara Sainai.
2 Ha we si na Refidim bulie ije, bata n'ọzara Sainai, we ma ulo-ikwū-ha n'ọzara ahu; Israel we ma ulo-ikwū-ha n'ebe ahu n'iru ugwu ahu.
3 Moses we rigokuru Chineke, Jehova we si n'ugwu ahu kpọ ya òkù, si, Otú a ka i gāsi ulo Jekob, gosi kwa umu Israel;
4 Unu onwe-unu ahuwo ihe M'mere ndi Ijipt, ebu-kwa-ram unu n'elu nkù ugo, me ka unu biakutem.