20 Mb͕e onye ọ bula gēwere nkpa-n'aka ti orù-ya nwoke, ma-ọbu orù-ya nwayi, ọ we nwua n'okpuru aka-ya; aghaghi ibọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya.
21 Ma otú ọ di, ọ buru na otù ubọchi ma-ọbu ubọchi abua ka ọ gānọru, agaghi-abọ ọ́bọ̀-ya n'aru ya: n'ihi na ego-ya ka ọ bu.
22 Mb͕e ndikom nālu ọgu, we tie nwayi di ime ihe, ime-ya we pua, ma ajọ ihe aputagh: aghaghi iri ya nra, dika di nwayi ahu gātukwasi ya; ọ gēnye kwa site n'aka ndi-ikpé.
23 Ma ọ buru na ajọ ihe aputa, i gēme kwa ka ndu lara ndu,
24 anya lara anya, ezé lara ezé, aka lara aka, ukwu lara ukwu,
25 ida-ọku lara ida-ọku, ob͕ub͕u-mma lara ob͕ub͕u-mma, ufiri-utari lara ufiri-utari.
26 Mb͕e onye ọ bula gēti anya orù-ya nwoke, ma-ọbu anya orù-ya nwayi, ihe, we bibie ya; o gēzipu kwa ya ka ọ nwere onwe-ya n'ihi anya-ya.