3 Ọ buru na ọ bata nání ya, ọ gāpu nání ya: ọ buru na onye nwere nwunye ka ọ bu, nwunye-ya gēso kwa ya pua.
4 Ọ buru na onye-nwe-ya enye ya nwunye, nwayi ahu ewe muara ya umu-ndikom ma-ọbu umu-ndinyom; nwayi ahu na umu-ya gābu ihe onye-nwe-ya nwere, ma ọ gapu nání ya.
5 Ma ọ buru na orù ahu asi n'ezie, Ahurum onye-nwem na nwunyem na umum n'anya; m'gaghi-apu nwere onwem:
6 onye-nwe-ya gēme kwa ka ọ biakute Chineke nso, ọ gēme kwa ka ọ biarue nso ọnu-uzọ, ma-ọbu nso awara-uzọ; onye-nwe-ya gēwere arà rapue nti-ya; ọ gābu kwa orù-ya rue mb͕e ebighi-ebi.
7 Ma mb͕e nwoke gēre nwa-ya nwayi ka ọ buru orù-nwayi, ọ gaghi-apu dika ọpupu orù-ndikom.
8 Ọ buru na ọ jọ njọ n'anya onye-nwe-ya, bú onye kwere na ya onwe-ya gālu ya na nwunye, ọ gēkwe kwa ka ab͕aputa ya: ọ gaghi-enwe ike ire ya nye ndi ala ọzọ, n'ihi na ọ ghọb͕uru ya.
9 Ma ọ buru na ọ kwere na nwa-ya nwoke gālu ya, dika ihe ekpere n'ikpe bayere umu-ndinyom si di, otú a ka ọ gēme ya.