16 Mb͕e nwoke gārafu nwa-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke nke ọ dighi nwoke kwere ilu ya, o we dinayere ya, ọ ghaghi inye ego ọlulu bayere ya ka ọ buru nwunye-ya.
17 Ọ buru na nna-ya ajusi ike iwere ya nye ya, ọ gākwu ego dika ego ọlulu umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke si di.
18 Ekwela ka nwayi-mb͕asi di ndu.
19 Onye ọ bula ya na anumanu nēdina, aghaghi ime ka ọ nwua.
20 Onye nāchuru chi àjà, ma-ọbughi ichuru Jehova, nání Ya, agēwezuga ya ka ebibie ya.
21 Gi emela ọbìa ihe-ike, emeb͕u-kwa-la ya: n'ihi na ndi-ọbìa ka unu buri n'ala Ijipt.
22 Nwayi ọ bula di-ya nwuru, ma-ọbu nwa-nb͕ei, unu ewedala ya n'ala.