12 Ma nkwupu nke fọduru nime ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū ahu, bú nkera ákwà-nkwuba nke fọduru, gākwupu n'azu ebe-obibi ahu.
13 Cubit ahu nke di n'otù akuku, na cubit ahu nke di n'akuku nke-ọzọ, nime nke fọduru n'ogologo nke ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū, ọ gākwupu n'akuku abua nke ebe-obibi ahu, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ikpuchi ya.
14 I gēme-kwa-ra ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya.
15 I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ.
16 Cubit iri ka ogologo nke otù ibo gādi, otù cubit na nkera cubit ka obosara nke otù ibo gādi kwa.
17 Otù ibo gēnwe ihe-nhiọye abua, nke ekwukọtara, otù na ibe-ya: otú a ka i gēmere ibo nile nke ebe-obibi ahu.
18 I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo ahu, orú ibo i gēmere akuku Ndida chere iru na Ndida.