9 I gējikọta kwa ákwà-nkwuba ise iche, na ákwà-nkwuba isi iche, piaji ákwà-nkwuba nke-isi n'ebe iru ulo-ikwū di.
10 I gēme kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke otù ákwà-nkwuba ahu dipuru adipu nime njikọta ahu, me kwa ọgu anya-nko abua na iri n'elu ọnu-ọnu nke ákwà-nkwuba nke dipuru adipu nime njikọta nke abua.
11 I gēme kwa ọgu nko ọla abua na iri, me ka nko ahu ba n'anya-nko ahu, i we jikọta ulo-ikwū ahu, ọ we buru otù.
12 Ma nkwupu nke fọduru nime ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū ahu, bú nkera ákwà-nkwuba nke fọduru, gākwupu n'azu ebe-obibi ahu.
13 Cubit ahu nke di n'otù akuku, na cubit ahu nke di n'akuku nke-ọzọ, nime nke fọduru n'ogologo nke ákwà-nkwuba nke ulo-ikwū, ọ gākwupu n'akuku abua nke ebe-obibi ahu, n'otù akuku na n'akuku nke-ọzọ, ikpuchi ya.
14 I gēme-kwa-ra ulo-ikwū ahu ihe-nkpuchi akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, ya na ihe-nkpuchi akpukpọ seal n'elu ya.
15 I gēme-kwa-ra ebe-obibi ahu ibo osisi acacia, nke nēguzo ọtọ.