2 I gēme kwa mpì-ya n'elu nkuku anọ ya: mpì-ya gēsite na ya: i gāmachita kwa ya ọla.
3 I gēme kwa ite-ya nile inara ntu-ya, na osekè-ya nile, na ọkwa-nwusa-ya nile, na ndudu-ya nile, na ihe-igu-ọku-ya nile: ọbuná ihe-ya nile ka i geji ọla me.
4 I gēme-kwa-ra ya ihe-ọkpukpa, ihe eji ub͕u ọla me; i gēme kwa nb͕a-aka ọla anọ n'elu ub͕u ọla ahu, n'elu nsọtu-ya anọ.
5 I gētiye ya n'okpuru ebe dipuru adipu buruburu ebe-ichu-àjà ahu n'okpuru, ka ub͕u ọla ahu we rue na nkera ebe-ichu-àjà ahu.
6 I gēme-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu nkpa-n'aka, bú nkpa-n'aka osisi acacia, machita ha ọla.
7 Agēme ka nkpa-n'aka ahu ba na nb͕a-aka ahu, nkpa-n'aka ahu gādi kwa n'elu akuku abua nke ebe-ichu-aja, mb͕e anēbu ya.
8 I gēwere ibo me ya ka ọ di ka ib͕e: dika emeworo ka i hu ya anya n'ugwu a, otú a ka ha gēme ya.