26 I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tukwasi ha n'elu nsọtu abua nke ihe-ib͕ochi-obi ahu, n'ọnu-ọnu-ya, nke chere iru n'akuku ephod ahu nime.
27 I gēme kwa nb͕a-aka ọla-edo abua, tiye ha n'elu ubu abua nke ephod n'okpuru, n'ebe iru-ya di, na nso njikọta-ya, n'elu ihe-ọkiké ephod nke onye-ọ̀kà kpara.
28 Ha gēwere kwa eriri-nma ogho anunu ke ihe-ib͕ochi-obi ahu na nb͕a-aka ephod site na nb͕a-aka-ya, ka ọ we di n'elu ihe-ọkiké ephod ahu nke onye-ọ̀kà kpara, ya na ka ewe ghara isi n'ephod tọpu ihe-ib͕ochi-obi ahu.
29 Eron gēbu kwa aha umu Israel n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé n'elu obi-ya, mb͕e ọ nābà n'ebe nsọ ahu, ibu ihe-ncheta n'iru Jehova mb͕e dum.
30 I gētiye kwa n'ihe-ib͕ochi-obi nke ikpé ahu Ìhè ahu na Izu-okè ahu; ha gādi kwa n'elu obi Eron mb͕e ọ nābà nime n'iru Jehova: Eron gēbu kwa ikpé nke umu Israel n'elu obi-ya n'iru Jehova mb͕e dum.
31 I gēme kwa uwe-nwuda ephod, ọ gābusi ogho anunu ogho anunu.
32 Ọnu nke isi-ya gādi n'etiti ya: ọnu-ọnu, bú ọlu ọkpa-ákwà, ka ọnu-ya gēnwe buru-buru, dika ọnu nke uwe-obi agha ka ọ gēnwe, ka ewe ghara idọwa ya.