16 I gēb͕u ebulu ahu, were ọbara-ya, wusa n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.
17 I gābọ kwa ebulu ahu n'ọbubọ-ya, sa ihe-ime-ya na ọlu-ukwu na ọlu-aka-ya, tiye ha n'elu ọbubọ-ya, na n'elu isi-ya.
18 I gēsure kwa ebulu ahu nile ọku ibu ihe nēsì ísì utọ n'elu ebe-ichu-àjà: àjà-nsure-ọku anēsurere Jehova ka ọ bu: ihe ísì utọ, àjà-ọku anāchuru Jehova, ka ọ bu.
19 I gēwere kwa ebulu nke-ọzọ; Eron na umu-ya ndikom gēbikwasi kwa aka-ha n'isi ebulu ahu.
20 I gēb͕u kwa ebulu ahu, were ufọdu nime ọbara-ya, tiye n'ọnu-ọnu nti aka-nri Eron, na n'ọnu-ọnu nti aka-nri umu-ya ndikom, na n'isi-aka nke aka-nri-ha, na n'isi-ukwu nke ukwu aka-nri ha, wusa kwa ọbara-ya n'ebe-ichu-àjà ahu buruburu.
21 I gēwere kwa ufọdu nime ọbara nke di n'elu ebe-ichu-àjà, na ufọdu nime manu nke otite-manu ahu, fesa n'aru Eron, na n'elu uwe-ya, na n'aru umu-ya ndikom, na n'elu uwe umu-ya ndikom tiyere ya: ọ gādi kwa nsọ, ya onwe-ya, na uwe-ya, na umu-ya ndikom, na uwe umu-ya ndikom tiyere ya.
22 I gēsi kwa n'ebulu ahu were abuba-ya, na akuku ọdudu-ya nwere abuba, na abuba nke nēkpuchi ihe-ime-ya, na mba-imeju nke imeju, na akọrọ-ya abua, na abuba nke di n'elu ha, na utaku-ukwu aka-nri-ya; n'ihi na ebulu nke nmeju-aka ka ọ bu: