22 Jehova we gwa Moses okwu, si,
23 Gi onwe-gi kwa, chiri n'onwe-gi uda nile kachasi nma, myrrh nke nērù erù, nnù shekel na ọgu ise, na uda-cinnamon, nkera-ya, bú ọgu shekel iri na ọgu abua na iri, na uda-calamus, ọgu shekel iri na ọgu abua na iri,
24 na cassia, nnù shekel na ọgu ise, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di, na manu olive, otù hin:
25 i gēme ya ka ọ buru manu otite-manu di nsọ, manu-otite nēsì ísì utọ asugwara asugwa, bú ọlu nke onye nāsugwa manu-otite nēsì ísì utọ: manu otite-manu di nsọ ka ọ gābu.
26 I gēwere ya te ulo-ikwū nzute, na ib͕e ihe-àmà ahu,
27 na table ahu na ihe-ya nile, na ihe-idọba-oriọna na ihe-ya nile, na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ,
28 na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku na ihe-ya nile, na ite ọsisa-miri ahu na ukwu-ala-ya.