4 Nb͕a-aka ọla-edo abua ka i gēme-kwa-ra ya n'okpuru mpempe-ya, n'elu ihe-akuku-ya abua, i gēme ha n'elu akuku-ya abua; ha gābu kwa ọnọdu inara nkpa-n'aka eji ebu ya.
5 I gēji kwa osisi acacia me nkpa-n'aka ahu, i gāmachita kwa ha ọla-edo.
6 I gētiye ya n'iru ákwà-nb͕ochi nke di n'akuku ib͕e ihe-àmà, n'iru ebe-nkpuchi-nmehie nke di n'elu ihe-àmà ahu, ebe M'gēzute gi.
7 Eron gēsure kwa n'elu ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me: kwa-ututu, mb͕e ọ nēdozi oriọna, ka ọ gēsure ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ.
8 Mb͕e Eron nēweli oriọna n'etiti ehihie na anyasi ka ọ gēsure kwa ya ọku ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, ọ bu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ anēsure n'iru Jehova mb͕e dum rue ọb͕ọ-unu nile.
9 Unu ewerela ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ nke ala ọzọ, ma-ọbu àjà-nsure-ọku, ma-ọbu onyinye-inata-iru-ọma, sure dika àjà n'elu ya; unu awusi-kwa-la àjà-ihe-ọṅuṅu n'elu ya.
10 Eron gēkpuchi kwa nmehie n'elu mpì-ya otù ub͕ò n'arọ: site n'ọbara àjà-nmehie nke nkpuchi-nmehie ka o gēkpuchi nmehie n'elu-ya otù ub͕ò n'arọ rue ọb͕ọ-unu nile: ebe nsọ kachasi ebe nsọ nile ka ọ buru Jehova.