18 Ọ si, Biko, me ka m'hu ebube-Gi.
19 Ọ si, Mu onwem gēme ka idi-nmam nile gabiga n'iru gi, M'gākpọ kwa òkù bayere aha Jehova n'iru gi: M'gēme-kwa-ra onye ahu amara, bú onye M'gēmere amara, M'gēnwe kwa obi-ebere n'aru onye ahu nke M'gēnwe obi-ebere n'aru ya.
20 Ọ si kwa, I pughi ihu irum anya: n'ihi na madu agaghi-ahum anya, di kwa ndu.
21 Jehova we si, Le, ọnọdu di n'akukum, i gēguzo kwa onwe-gi ọtọ n'elu oké nkume ahu.
22 O gēru kwa, mb͕e ebubem nāgabiga, na M'gētiye gi nime oghere nke oké nkume ahu, b͕asa ọbu-akam b͕ochita gi, rue mb͕e M'gabiga-woro:
23 M'gēwezuga kwa ọbu-akam, i gāhu kwa azum anya: ma agaghi-ahu irum anya.