27 Jehova we si Moses, Dere onwe-gi okwu ndia n'ihe: n'ihi na dika okwu ndia si di ka M'b͕aworo ndu n'etiti Mu na gi, na n'etiti Mu na umu Israel.
28 Ọ we nọ n'ebe ahu, ya na Jehova, ọgu ubọchi abua ehihie na abali; ọ dighi nri o riri, ọ dighi kwa miri ọ ṅuru. Ọ we de n'elu mbadamba nkume abua ahu okwu nile nke ọb͕ub͕a-ndu ahu, bú okwu iri ahu.
29 O rue, mb͕e Moses siri n'ugwu Sainai rida (mbadamba nkume abua nke ihe-àmà ahu di kwa n'aka Moses mb͕e o siri n'ugwu ahu rida), na Moses amaghi na akpukpọ iru-ya nēnwuputa ìhè mb͕e Ọ kpayere ya uka.
30 Eron na umu Israel nile we hu Moses, ma, le, akpukpọ iru-ya nwuputara ìhè; ha we tua egwu ibiaru ya nso.
31 Moses we kpọ ha òkù; Eron na ndi-isi nile nime nzukọ ahu we laghachikute ya: Moses we gwa ha okwu.
32 Emesi kwa umu Israel nile biaruru nso, ọ we nye ha n'iwu uka nile nke Jehova kpayere ya n'ugwu Sainai.
33 Moses we gwabìe ha okwu, kpudo ihe-nkpudo n'iru-ya.