27 Ndi-isi chitara nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod ahu, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi ahu;
28 na uda ahu, na manu ahu; itiye n'ihe nēnye ìhè, na ibu manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me.
29 Nwoke ọ bula na nwayi ọ bula, ndi obi-ha mere ka ha nwe afọ-ofufo iweta ihe iji je ozi nile, nke Jehova nyere iwu ka eme n'aka Moses, umu Israel ahu wetara onyinye afọ-ofufo nye Jehova.
30 Moses we si umu Israel, Lenu, Jehova akpọwo Bezalel n'aka, bú nwa Uri, nwa Hua, nke ebo Juda;
31 Ọ mejuwo kwa ya na Mọ nke Chineke, n'amam-ihe, na nime nghọta, na n'ihe-ọmuma, na n'ije-ozi ọ bula;
32 ya na icheputa ọlu onye-ọ̀kà di iche iche, ilu ọlu n'ọla-edo, na n'ọla-ọcha, na n'ọla,
33 na n'ilu ọlu onye-ọ̀ka na nkume ihiọgide ahiọgide, na n'ilu ọlu onye-ọ̀kà n'osisi, ilu ọlu n'ije-ozi ọ bula nke onye-ọ̀kà.