5 Sinu n'etiti unu wetara Jehova àjà-nbuli: onye ọ bula nke obi-ya nwere afọ-ofufo, ya weta ya, bú àjà-nbuli nke Jehova; ọla-edo, na ọla-ọcha, na ọla;
6 na ogho anunu, na ogho ododo, na ogho uhie, na ezi ákwà ọcha, na aji ewu;
7 na akpukpọ ebulu esijiri ọbara-ọbara, na akpukpọ seal, na osisi acacia;
8 na manu itiye n'ihe nēnye ìhè, na uda di iche iche itiye na manu nke otite-manu ahu, na ibu ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me;
9 na nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.
10 Onye ọ bula n'etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n'iwu;
11 ebe-obibi ahu, na ulo-ikwū-ya, na ákwà-nkpuchi-ya, na nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile,