9 na nkume onyx, na nkume ihiọgide n'ihe, ihiọgide n'ephod, na ihiọgide n'ihe-ib͕ochi-obi.
10 Onye ọ bula n'etiti unu nke nwere obi amam-ihe, ha gābia kwa, me ihe nile nke Jehova nyere n'iwu;
11 ebe-obibi ahu, na ulo-ikwū-ya, na ákwà-nkpuchi-ya, na nko-ya nile, na ibo-ya nile, na nkpọrọ-ya nile, na ide-ya nile, na ukwu-ya nile,
12 na ib͕e ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ebe-nkpuchi-nmehie, na ákwà-nb͕ochi nke ákwà-nkwuchi;
13 na table ahu, na nkpa-n'aka-ya abua, na ihe-ya nile, na achicha iru Chineke;
14 na ihe-idọba-oriọna nke ihe nēnye ìhè, na ihe-ya nile, na oriọna-ya nile, na manu itiye n'ihe nēnye ìhè;
15 na ebe-ichu-àjà nke ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, na nkpa-n'aka-ya abua, na manu nke otite-manu ahu, na ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ eji uda utọ di iche iche me, na ákwà-nkwuchi ọnu-uzọ n'ọnu-uzọ nke ebe-obibi ahu;